Psalms 26

Abụ Ọma Devid.

Ekpere nke ezi mmadụ

1 Onyenwe anyị, biko kpepụta m,
nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;
atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi,
na-eleghị anya nʼazụ.
2Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,
nyochaa obi m na echiche m.
3Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.
Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.

4Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.
Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.
5Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.
Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.
6Ana m asacha aka
Ọ bụrụ na mmadụ asacha maọbụ kwọọ aka ya nʼihu ọha, ọ na-apụta ngọpụ site nʼihe na-ezighị ezi, maọbụ onye dị otu a na-asị, ikpe amaghị m. Abụ 73:13
m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,
na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.
7Ana m abụkwa abụ ekele,
jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.

8O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,
ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.
9Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,
ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,
10ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,
aka nri ha jupụtakwara na ngarị.
11Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;
gbapụta m ma meere m ebere.

12Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;
aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.
Copyright information for IboBIU